26 N'ihi na Jehova huru nweda-n'ala nke Israel, na ọ di ilu nke-uku: ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọdu onye arapuru fọduru, ọ dighi kwa onye-iye-aka ọ bula Israel nwere.
27 Ma Jehova ekwughi na Ọ gēhichapu aha Israel n'okpuru elu-igwe: O we si n'aka Jeroboam nwa Joash zọputa ha.
28 Ma okwu Jeroboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, otú o buru agha, otú o weghachi-kwa-ra Damaskọs, na Hemat, nke Juda nwere, nye Israel, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
29 Jeroboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, bú ndi-eze Israel; Zekaraia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.