19 Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya.
20 Menahem we naputa ego ahu n'aka Israel, bú n'aka ndi-dike n'àkù, inye eze Asiria, ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri diri otù nwoke. Eze Asiria we laghachi, o guzoghi kwa n'ebe ahu n'ala ahu.
21 Ma okwu Menahem nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
22 Menahem we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Pekahaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
23 N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri nke Azaraia, bú eze Juda, ka Pekahaia nwa Menahem malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ abua.
24 O wee me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.
25 Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.