13 Jehova we b͕ara Israel àmà, b͕a-kwa-ra Juda, site n'aka onye-amuma ọ bula, na onye-ọhu-uzọ ọ bula, si, Sinu n'uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M'nyere n'iwu, na ukpurum nile, dika iwu ahu nile si di nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu, nke M'zite-kwa-ra unu n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma.
14 Ma ha anughi, kama ha kwesiri olu-ha ike, dika olu ndi bu nna-ha, ndi nēkweghi na Jehova, bú Chineke-ha.
15 Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha.
16 Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè.
17 Ha me-kwa-ra ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gabiga nime ọku, ha nāju kwa ase, nāb͕a afa, re onwe-ha ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.
18 Jehova we wesa Israel iwe nke-uku, si n'iru Ya wezuga ha: ọ dighi ndi fọduru, nābughi ebo Juda, nání ya.
19 Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, kama ha jeghariri n'ukpuru nile nke Israel nke ha mere.