19 Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, kama ha jeghariri n'ukpuru nile nke Israel nke ha mere.
20 Jehova we ju nkpuru nile nke Israel, weda ha n'ala, nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha.
21 N'ihi na Ọ dọwapuru Israel n'ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n'iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku.
22 Umu Israel we jegharia nime nmehie nile nke Jeroboam, nke o mere; ha esighi nime ha wezuga onwe-ha;
23 rue mb͕e Jehova siri n'iru Ya wezuga Israel, dika O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma. Ewe me ka Israel si n'elu ala-ha je biri n'Asiria, rue ta.
24 Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile.
25 O rue, na nmalite obibi-ha n'ebe ahu, na ha atughi egwu Jehova: Jehova we zìe ọdum n'etiti ha, ha we nēb͕u ufọdu nime ha.