34 Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n'iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n'iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel;
35 Jehova we soro ha b͕a ndu, nye ha iwu, si, Unu atula egwu chi di iche iche ọzọ, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu achu-kwara-la ha àjà:
36 kama Jehova, Onye were ike uku na ogwe-aka esetiri eseti me ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, Ya ka unu gātu egwu, Ya ka unu gākpọ kwa isi ala nye, Ya ka unu gāchu-kwa-ra àjà:
37 ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:
38 ma ọb͕ub͕a-ndu Mu na unu b͕ara, unu echezọla ya; unu atu-kwa-la egwu chi di iche iche ọzọ:
39 kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile.
40 Ma ha anughi, kama dika ikpé mbu ha si di ka ha onwe-ha nēme.