18 ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku, n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'ihì.
19 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi.
20 Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú, a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.
21 Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion, elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi.
22 Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.
23 I siri n'aka ndi-ozi-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu ime, rue akuku nile Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe-nnọdu-abali nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.
24 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri ala ọzọ, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.