8 Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka o nēbuso Libna agha: n'ihi na ọ nuru na o siwo na Lekish bulie ije.
9 O we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Le, ọ putawo ibuso gi agha: o we zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia ọzọ, si,
10 Otú a ka unu gāgwa Hezekaia, bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria.
11 Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi?
12 Chi nile nke mba nile ọzọ hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Edem, ndi nọ na Telasa?
13 Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?
14 Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ha: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova.