21 Ọ pua je n'ebe miri si asuputa, o we tubà nnú n'ebe ahu, si, Otú a ka Jehova siri, Emewom ka miri a buru ihe inye ezi-ndu; ọnwu ma-ọbu ala nādighi-ekwe ka ihe ka aka agaghi-adi kwa ọzọ site n'ebe ahu.
22 Ewe me ka miri ahu buru ihe inye ezi-ndu rue ta, dika okwu Elaisha si di, nke o kwuru.
23 O si n'ebe ahu rigorue Bet-el: ma mb͕e ya onwe-ya nārigo n'uzọ, umu-okoro siri n'obodo puta, we kwa ya emò, si ya, Rigo, onye-isi-nkwọcha; rigo, onye-isi-nkwọcha.
24 Ọ le anya n'azu-ya, hu ha, kọcha ha n'aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n'oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n'etiti ha.
25 O si n'ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n'ebe ahu laghachi na Sameria.