16 Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova.
17 Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.
18 Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n'aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n'ulo uku eze Babilon.
19 Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, Ọ̀ bughi otú a, ma ọ buru na udo na ezi-okwu adi n'ubọchim nile?
20 Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na otú o mere ọdọ-miri, na uzọ-miri, we me ka miri rubata n'obodo, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
21 Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.