1 N'ubọchi-ya Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro, Jehoiakim we ghọrọ ya orù arọ atọ: o we chigharia nupu isi n'okpuru ya.
2 Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.
3 N'ezie n'okwu-ọnu Jehova ka ihe a di n'aru Juda, isi n'iru Ya wezuga ha, n'ihi nmehie nile nke Manase, dika ihe nile si di nke o mere;
4 ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.