26 Ndi-Ju nile, site n'onye ntà we rue onye uku, na ndi-isi usu-ndi-agha nile, we bilie, biarue Ijipt: n'ihi na ha turu egwu ndi Kaldea.
27 O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o siri n'ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;
28 o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.
29 O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, ọ we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.
30 Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n'aka eze, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.