1 Ma Jehoram nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze arọ iri na abua.
2 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; nání na o meghi dika nna-ya, na dika nne-ya: o wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere.
3 Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.
4 Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri.
5 O rue, mb͕e Ehab nwuru, na eze Moab jehiere megide eze Israel.