1 Ma otù nwayi n'etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n'onwe-ya umum abua ka ha buru orù.
2 Elaisha we si ya, Gini ka m'gēmere gi? gosim; gini ka i nwere n'ulo? Ọ si, Ọ dighi ihe ọ bula orù-gi nwayi nwere n'ulo, ọ bu nání ite manu.
3 Ọ si, Je, riọtara onwe-gi ihe n'èzí n'aka ndi-ab͕ata-obi-gi nile, bú ihe ihe nādighi nime ha; ha abula ole-na-ole.
4 I gābà kwa n'ulo, mechibido onwe-gi, mechibido kwa umu-gi ndikom, uzọ, b͕aye manu di n'ite ahu n'ihe ahu nile, buzuga nke juru eju.
5 O we si n'ebe ọ nọ la, mechibido onwe-ya, mechibido kwa umu-ya ndikom, uzọ; ha onwe-ha nēbutere ya ihe ahu nso, ma ya onwe-ya nāb͕aye ab͕aye.