2 Elaisha we si ya, Gini ka m'gēmere gi? gosim; gini ka i nwere n'ulo? Ọ si, Ọ dighi ihe ọ bula orù-gi nwayi nwere n'ulo, ọ bu nání ite manu.
3 Ọ si, Je, riọtara onwe-gi ihe n'èzí n'aka ndi-ab͕ata-obi-gi nile, bú ihe ihe nādighi nime ha; ha abula ole-na-ole.
4 I gābà kwa n'ulo, mechibido onwe-gi, mechibido kwa umu-gi ndikom, uzọ, b͕aye manu di n'ite ahu n'ihe ahu nile, buzuga nke juru eju.
5 O we si n'ebe ọ nọ la, mechibido onwe-ya, mechibido kwa umu-ya ndikom, uzọ; ha onwe-ha nēbutere ya ihe ahu nso, ma ya onwe-ya nāb͕aye ab͕aye.
6 O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi.
7 O we bia, gosi onye nke Chineke. Ọ si, Je, re manu ahu, kwua ugwọ-gi, gi onwe-gi na umu-gi ndikom were nke fọduru di ndu.
8 Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n'ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n'ebe ahu iri nri.