25 O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:
26 biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n'udo? di-gi, ọ̀ nọ n'udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n'udo? Ọ si, Ayi nọ n'udo.
27 O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.
28 O we si, Àriọrọm nwa-nwoke n'aka onye-nwem? àsighm, Arafulam?
29 O we si Gihezi, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were kwa nkpa-n'akam n'aka-gi, je: mb͕e i zutere nwoke ọ bula, ekelela ya; mb͕e nwoke ọ bula gēkele gi, azala ya: tukwasi nkpa-n'akam n'iru nwa-okoro ahu.
30 Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya.
31 Gihezi we gabiga n'iru ha, tukwasi nkpa-n'aka ahu n'iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi.