15 O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.
16 Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, m'gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju.
17 Neaman we si, Ọ buru na i naghi, biko, ka enye orù-gi ibu ájá nke inyinya mule abua gēbu; n'ihi na orù-gi agaghi-emere chi ọzọ àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ site n'ub͕u a, ma ọ bu náni Jehova.
18 Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n'ulo Rimon ikpọ isi ala n'ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n'akam, m'we kpọ isi ala n'ulo Rimon, mb͕e m'kpọrọ isi ala n'ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n'ihe a.
19 Ọ si ya, La n'udo. O we si n'ebe ọ nọ je n'uzọ-ya nwantī.
20 Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n'ebe Neaman onye Siria nka nọ, n'ighara inara n'aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n'ezie m'gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n'aka-ya.
21 Gihezi we chuso Neaman. Neamam we hu otù onye nāb͕aso ya, o we si n'ub͕ọ-ala-ya rida izute ya, si, Ùdo di kwa?