1 Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa.
2 Biko, ka ayi jerue Jọdan, si kwa n'ebe ahu were, nwoke ọ bula otù ntuhie, mere onwe-ayi otù ebe n'ebe ahu, ibiri n'ebe ahu. Ọ si, Jenu.
3 Otù onye we si, Biko, kwere, soro ndi-orù-gi je. Ọ si, Mu onwem gēje.
4 O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi.