12 Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi.
13 Ọ si, Jenu, hu ebe ya onwe-ya nọ, ka m'we ziga kuta ya. Ewe gosi ya, si, Le, ọ nọ na Dotan.
14 O we ziga inyinya na ub͕ọ-ala na oké usu-ndi-agha n'ebe ahu: ha we bia n'abali, je obodo ahu buruburu.
15 Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n'isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?
16 Ọ si, Atula egwu: n'ihi na ndi ayi na ha nọ di ọtutu kari ndi ha na ha nọ.
17 Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n'inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha.
18 Ha we ridakute ya, Elaisha we kpere Jehova, si, Biko, were ìsì tie mba nka. O we were ìsì tie ha dika okwu Elaisha si di.