10 Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n'ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha.
11 Mọdekai we nējeghari n'iru ogige ulo ndinyom n'ubọchi nile ọ bula, imara udo Esta, na ihe agēme ya.
12 Ma mb͕e orúrú nwa-ab͕ọghọ ọ bula biaruru nso ibakuru eze, bú Ahasuerọs, mb͕e ọnwa iri na abua gwusiri ya, dika iwu ndinyom si di, (n'ihi na otú a ka anēmezu ubọchi nsacha-ha, bú ọnwa isi iji manu myrrh, na ọnwa isi iji uda di iche iche na iji ihe-nsacha ndinyom,)
13 nwa-ab͕ọghọ ahu we biakute eze n'uzọ di otú a, anēnye ya ihe ọ bula ọ nāsi ha nye, iso ya si n'ulo ndinyom biarue ulo eze.
14 N'anyasi ka nwayi ahu batara, n'ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n'ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n'aha.
15 Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya.
16 Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n'ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n'arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.