Esta 3:8-14 IGBOB

8 Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha.

9 Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n'akwukwọ ime ka ha la n'iyì: m'gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n'aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n'ulo-àkù eze.

10 Eze we si n'aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju.

11 Eze we si Heman, Enyewo gi ọla-ọcha, ya na ndi ahu, ime ha dika ihe ahu si di nke di nma n'anya-gi.

12 Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.

13 Ewe site n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n'iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n'otù ubọchi, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha.

14 Ndeputa odide-akwukwọ ahu, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ha nọ na njikere bayere ubọchi a.