2 o we bia rue n'iru ọnu-uzọ-ama eze: n'ihi na ọ dighi onye gābà n'ọnu-uzọ-ama eze n'uwe nke ákwà-nkpe.
3 Ọzọ, n'ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n'obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ọtutu madu.
4 Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n'obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n'aru-ya: ma ọ naraghi ha.
5 Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n'iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka.
6 Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n'iru ọnu-uzọ-ama eze.
7 Mọdekai we gosi ya ihe nile mere ya, kọ-kwa-ra ya isi ego ahu nke Heman siri na ọ gātù nye n'ulo-àkù eze n'ihi ndi-Ju, ime ka ha la n'iyì.
8 Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n'iru ya.