1 N'abali ahu urá eze fepuru n'anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n'ubọchi ahu, ewe nāgu ha n'iru eze.
2 Ewe hu ihe a nke edere n'akwukwọ, bú na Mọdekai gosiri ihe bayere Bignata na Teresh, bú ndi-onozi abua nke eze, nime ndi nēche ngata-uzọ, ndi chọrọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.
3 Eze we si, Nsọpuru na idi-uku gini ka emere Mọdekai n'ihi ihe a? Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si, Ọ dighi ihe emere ya.
4 Eze we si, Ònye nọ n'ogige? Ma Heman abatawo n'ogige ulo eze nke di n'èzí, isi eze ka ọ kwuba Mọdekai n'osisi nke o doziri nye ya.
5 Ndi nējere eze ozi we si ya, Le, Heman nēguzo n'ogige. Eze we si, Ya bata.