3 Eze we si, Nsọpuru na idi-uku gini ka emere Mọdekai n'ihi ihe a? Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si, Ọ dighi ihe emere ya.
4 Eze we si, Ònye nọ n'ogige? Ma Heman abatawo n'ogige ulo eze nke di n'èzí, isi eze ka ọ kwuba Mọdekai n'osisi nke o doziri nye ya.
5 Ndi nējere eze ozi we si ya, Le, Heman nēguzo n'ogige. Eze we si, Ya bata.
6 Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n'obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim?
7 Heman we si eze, Nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ,
8 ka achita uwe ala-eze nke eze yiriworo, na inyinya nke eze nọkwasiworo, na okpu-eze nke ala-eze nke ekpukwasiworo ya n'isi:
9 ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n'aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ka ha kpọ kwa n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.