1 Eze na Heman we bata iso Esta, bú nwunye eze, ṅu manya-vine.
2 Eze we si kwa Esta n'ubọchi nke-abua, n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi, Esta, nwunye eze? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme kwa ya.
3 Esta, bú nwunye eze we za, si, Ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma, ka enyem ndum n'aririọm, na ndim n'ọchichọm:
4 n'ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n'iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m'gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n'ihe gēfunari eze.
5 Eze, bú Ahasuerọs, we za, si Esta, bú nwunye eze, Ònye ka ọ bu, bú onye a? òle ebe onye a nọ kwa, bú onye ahu nke obi-ya mere ka o zue ime otú a?