1 Ma n'ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, mb͕e okwu eze na iwu-ya biaruru nso ka eme ya, n'ubọchi mb͕e ndi-iro ndi-Ju lere anya ibu ndi-isi-ha; ma ab͕anwere ya, ndi-Ju onwe-ha we ghọ ndi-isi nke ndi nākpọ ha asì;
2 ndi-Ju kpọkọtara onwe-ha n'obodo nile ha n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, iseti aka megide ndi nāchọ ọdi-njọ-ha: ọ dighi kwa nwoke ọ bula guzoro n'iru ha; n'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ndi nile di iche iche.
3 Ndi-isi nile nke ala nile anāchi achi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi nāchi ala, na ndi nēje ozi eze nwere, ha nēye-kwa-ra ndi-Ju aka; n'ihi na oké egwu Mọdekai dakwasiri ha.
4 N'ihi na Mọdekai di uku n'ulo eze, akukọ-ya we nējezu n'ala nile anāchi achi: n'ihi na nwoke ahu, bú Mọdekai, nāga n'iru n'idi uku.
5 Ndi-Ju we were ntib͕u mma-agha na ob͕ub͕u na ila-n'iyì tib͕ue n'etiti ndi-iro-ha nile, me ndi nākpọ ha asì dika ọ tọrọ ha.
6 Ma nime Shushan, bú ulo uku eze, ndi-Ju b͕uru nnù ndikom na ọgu ise, me ka ha la n'iyì.