19 N'ihi nka ndi-Ju nke obodo nile nēnweghi mb͕idi, bú ndi bi n'obodo nēnweghi mb͕idi, nēme ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada ka ọ buru ubọchi ọṅù na ọṅuṅu-manya-vine, na ezi ubọchi, na ubọchi izigaritara onwe-ha òkè.
20 Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya,
21 ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n'arọ nile ọ bula,
22 dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n'aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n'ebe ha nọ, isi n'ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n'iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye.
23 Ndi-Ju we nara ihe ahu nke ha malitere ime, na nke Mọdekai degara ha n'akwukwọ;
24 n'ihi na Heman nwa Hamedata, onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju nile, chère èchìchè megide ndi-Ju ime ka ha la n'iyì, o we fe Pua, nke ahu bu nzà, ichusa ha, na ime ka ha la n'iyì;
25 ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi.