29 Esta, bú nwunye eze, nwa-nwayi Abihail, na Mọdekai, bú onye-Ju, we were ike nile de akwukwọ ime ka akwukwọ-ozi a nke-abua nke Purim guzosie ike.
30 O we zigara ndi-Ju nile akwukwọ, nke okwu udo na nke ezi-okwu di nime ha, rue ọgu ala anāchi achi isi na asa, bú nke ala-eze Ahasuerọs,
31 ime ka ubọchi ndia nke Purim guzosie ike nime mb͕e-ha ezubere ezube, dika Mọdekai, bú onye-Ju, na Esta, bú nwunye eze, mere ka ha guzosiere ha ike, na dika ha mere ka ha guzosiere onwe-ha, guzosi-kwa-ra nkpuru-ha, ike, bú okwu obubu-ọnu na ikwa-ákwá-ha.
32 Okwu-ọnu Esta we me ka okwu ndia nke Purim guzosie ike; ewe de ya n'akwukwọ.