6 Ma nime Shushan, bú ulo uku eze, ndi-Ju b͕uru nnù ndikom na ọgu ise, me ka ha la n'iyì.
7 Ha b͕u-kwa-ra Pashandata, na Dalfon, na Aspata,
8 na Porata, na Adalia, na Aridata,
9 na Pamashta, na Arisai, na Aridai, na Vaizata,
10 bú umu-ndikom iri nke Heman nwa Hamedata, bú onye nākpab͕u ndi-Ju; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.
11 N'ubọchi ahu ọnu-ọgugu ndi eb͕uru eb͕u na Shushan, bú ulo uku eze, biaruru n'iru eze.
12 Eze we si Esta, bú nwunye eze, Nime Shushan, bú ulo uku eze, ka ndi-Ju b͕uworo nnù ndikom na ọgu ise, na umu-ndikom iri Heman, me ka ha la n'iyì; gini kwa ka ha meworo n'ala anāchi achi nke fọduru nke eze? Ma gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi ọzọ? agēme kwa ya.