11 Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.
12 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi siteworo na mb͕e ochie, Jehova, bú Chinekem, Onye Nsọm? ayi agaghi-anwu. Jehova, ọ bu ikpe ikpe ka I doworo ya; Gi Oké Nkume, ọ bu kwa iba nba ka I tọworo ya ntọ-ala.
13 Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;
14 I we me madu ka ha di ka azù nke oké osimiri, dika ihe nākpu akpu, nke nēnweghi onye nāchi ha?
15 Ha nile ka o ji nkò-azù dọkpuru, o nēkpochapu ha n'eriri-ya, chikọta ha n'ub͕u-ya: n'ihi nka ka ọ nāṅuri, tegharia egwú ọṅù.
16 N'ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n'ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba.
17 Ọ̀ gēwere n'ihi nka nāwupu eriri-ya, ghara inwe ọmiko n'ib͕u mba di iche iche mb͕e dum?