1 Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n'elu Shigionoth.
2 Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu:Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile,N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya;N'oké iwe cheta obi-ebere.
3 Chineke si na Timan nābia,Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. SelahEbube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile,Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.
4 Onwunwu-Ya di ka ìhè;Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya:Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.