11 Anyanwu na ọnwa guzoro n'ebe-obibi-ha;N'ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga,N'onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.
12 N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala,N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.
13 I putawo ìhè izọputa ndi-Gi,Izọputa onye-Gi etere manu;I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu,B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah
14 I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi:Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam:Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.
15 I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri,Bú obo nke ọtutu miri.
16 Anurum, afọm we ma jijiji,N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta;Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji:Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu,Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.
17 Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine;Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo,Na ubi nile emeghi ihe-oriri;Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu,Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi: