16 Anurum, afọm we ma jijiji,N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta;Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji:Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu,Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.
17 Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine;Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo,Na ubi nile emeghi ihe-oriri;Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu,Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:
18 Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova,M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.
19 Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem,Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele,Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije.Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.