1 N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu, okwu Jehova we si n'aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si,
2 Biko, gwa Zerubabel nwa Shealtiel okwu, bú onye nāchi ala Juda, gwa kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, gwa kwa ndi Israel fọduru, si,
3 Ònye fọduru n'etiti unu nke huru ulo a n'ebube mbu ya? ọ̀ di kwa aṅa n'anya-unu onwe-unu ub͕u a? ọ̀ dighi nání ka ihe-efu n'anya-unu?
4 Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta),
5 dika okwu ahu si di nke Mu na unu b͕ara n'ọb͕ub͕a-ndu-mb͕e unu siri n'Ijipt puta, Mọm nēguzo kwa n'etiti unu: unu atula egwu.
6 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu;
7 M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.