11 Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.
12 Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe:
13 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O mee ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.
14 Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.
15 Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n'iyì.
16 Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.
17 Chikọputa ihe-agha-gi n'ala, gi onye bi n'obodo anānọchigide n'agha.