19 Ahuhu dirim bayere nb͕aji ukwu na akam! ọnyám nke etiputa jọrọ njọ: ma mu onwem siri, N'ezie nka bu ọriam, m'gēburu kwa ya.
20 Emebisiwo ulo-ikwūm, etibìsiwo kwa udọ̀m nile: umum esiwo n'ebe m'nọ pua, ha anọghi kwa: ọ dighi kwa onye nēseti ulo-ikwūm nākwuli kwa ákwà-nkwubam.
21 N'ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n'ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa.
22 Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n'ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia.
23 Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.
24 Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n'ikpé; adọlam aka na nti n'iwe-gi, ka I we ghara ibilatam.