1 Okwu Jehova we ruem nti, si
2 I gaghi-alutara onwe-gi nwunye, i gaghi-enwe kwa umu-ndikom na umu-ndinyom n'ebe a.
3 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere umu-ndikom baye-kwa-ra umu-ndinyom, ndi amuru n'ebe a, baye-kwa-ra nne-ha ndi muru ha, baye-kwa-ra nna-ha ndi muru ha n'ala nka, si,
4 Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.
5 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.
6 Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n'ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n'obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha: