11 Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.
12 Oche-eze nke di ebube, nke di n'elu site na mbu, ọnọdu nke ebe nsọ ayi,
13 olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.
14 Me ka m'diri ndu, Jehova, m'we diri ndu; zọputam, ewe zọputam: n'ihi otutom ka I bu.
15 Le, ndi ahu nāsim, Òle ebe okwu Jehova di? biko, ya bia.
16 Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.
17 Aghọlam ihe-ujọ: ebe-nb͕abàm ka I bu n'ubọchi ihe ọjọ.