5 Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n'ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya.
6 Ọ gādi kwa ka osisi tamarisk n'ala ihe nādighi, ọ gaghi-ahu kwa mb͕e ọdi-nma nābia; ma ọ gēbi n'ebe nile kpọrọ nku n'ọzara, bú ala nnú ebe madu nēbighi.
7 Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya.
8 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru.
9 Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?
10 Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.
11 Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.