19 Ṅam nti, Jehova, ge kwa nti olu ndi nālusom ọ̀gù.
20 Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi.
21 N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha.
22 Ka anuru iti-nkpu nke gēsite n'ulo nile ha, mb͕e I gēme ka usu ndi nāpunara madu ihe biakwasi ha na mberebe: n'ihi na ha egwuwo olùlù inwudem, ha ezobewo-kwa-ra ukwum abua ib͕udu di iche iche.