2 purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n'ebe ahu okwu nile nke M'gāgwa gi:
3 si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.
4 N'ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n'ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ;
5 ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim:
6 n'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u.
7 M'gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n'ebe a dika miri; M'gēme kwa ka ha da site na mma-agha n'iru ndi-iro-ha, na site n'aka ndi nāchọ ndu-ha: M'gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.
8 M'gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.