17 Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya.
18 N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya!
19 Olìlì nke inyinya-ibu ka agēji lìe ya, agādọrọ ya, tufue ya n'ebe di anya n'azu ọnu-uzọ-ama Jerusalem.
20 Rigo na Lebanon, ti kwa nkpu; me kwa ka olu-gi da udà na Beshan: si kwa n'Abarim tie nkpu; n'ihi na etipiawo ndi nile nāhu gi-ri n'anya.
21 Agwaram i okwu n'udo-gi; ma i siri, M'gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.
22 Ndi-ọzùzù-aturu-gi nile ka ifufe gāzù dika aturu, ndi nāhu gi n'anya gēje na ndota-n'agha: n'ezie mb͕e ahu ka ihere gēme gi, agētiye kwa gi n'ọnọdu-ihere, site n'ihe ọjọ gi nile.
23 Gi nwanyi nēbi na Lebanon, nke nālu akwu-gi n'etiti osisi cedar nile, le, ka i si buru onye agēmere amara nke-uku mb͕e ihe-nb͕u nābiakwasi gi, nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme!