17 Ha nọ nāsi ndi nēlelìm, Jehova ekwuwo okwu, si, Udo gādiri unu; ọ bu kwa onye ọ bula nke nējeghari n'isi-ike nke obi-ya ka ha siworo, Ihe ọjọ agaghi-abiakwasi unu.
18 N'ihi na ònye guzoworo n'ìzù nzuzo nke Jehova, nke ọ gāhu nu kwa okwu-Ya? ònye ṅaworo okwum nti, we nu ya?
19 Le, oké ifufe Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọbuná oké ifufe nēfesi ike buruburu: n'isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.
20 Iwe Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mere ya, ru kwa mb͕e O mere ka ihe-nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia unu gāghọta ya nke-ọma.
21 Eziteghm ndi-amuma ahu, ma ha onwe-ha b͕ara ọsọ: agwaghm ha okwu, ma ha onwe-ha buru amuma.
22 Ma ọ buru na ha guzori n'ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n'uzọ ọjọ ha na n'ihe ọjọ nke omume nile ha, lata.
23 Ọ̀ bu Chineke nke nọ nso ka M'bu, ghara ibu Chineke nọ n'ebe di anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.