21 Eziteghm ndi-amuma ahu, ma ha onwe-ha b͕ara ọsọ: agwaghm ha okwu, ma ha onwe-ha buru amuma.
22 Ma ọ buru na ha guzori n'ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n'uzọ ọjọ ha na n'ihe ọjọ nke omume nile ha, lata.
23 Ọ̀ bu Chineke nke nọ nso ka M'bu, ghara ibu Chineke nọ n'ebe di anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
24 Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n'ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M'juputara? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
25 Anuwom ihe ahu nke ndi-amuma siri, bú ndi nēbu amuma agha n'aham, si, Arọwom nrọ, arọwom nrọ.
26 Rùe ole mb͕e ka nka gādi n'obi ndi-amuma ndi nēbu amuma ugha; bú ndi-amuma nke nēbu amuma aghughọ nke obi-ha?
27 Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n'otù n'otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.