25 Anuwom ihe ahu nke ndi-amuma siri, bú ndi nēbu amuma agha n'aham, si, Arọwom nrọ, arọwom nrọ.
26 Rùe ole mb͕e ka nka gādi n'obi ndi-amuma ndi nēbu amuma ugha; bú ndi-amuma nke nēbu amuma aghughọ nke obi-ha?
27 Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n'otù n'otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.
28 Onye-amuma nke nrọ di ya n'ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n'ọnu, ya kwue okwum n'ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
29 Ọ̀ bughi otú a ka ọ di? na okwum di ka ọku, (ọ bu ihe sin'ọnu Jehova puta); na dika otùtù nke nētipia nkume di elu?
30 N'ihi nka, le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọbu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēzu okwum nile n'ori, onye ọ bula n'aka ibe-ya.
31 Le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēwere ire-ha kwue ihe, si, Ọ bu ihe si Ya n'ọnu puta.