2 Fig nke di nma nke-uku di n'otù nkata, dika fig nke buru uzọ cha: ma fig nke jọrọ njọ nke-uku di na nkata nke-ọzọ, nke anāgaghi-eri, site n'ijo-njọ-ha.
3 Jehova we sim, Gini ka onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Fig; ndi bu ezi fig di nma nke-uku; ma ndi bu fig ọjọ jọrọ njọ nke-uku, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.
4 Okwu Jehova we ruem nti, si,
5 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri; Dika ezi fig ndia, otú a ka M'gāmata ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi M'siri n'ebe a ziga n'ala ndi Kaldea, ime ha nma.
6 N'ihi na M'gātukwasi ha anyam ime ha nma, M'gēme kwa ka ha lata n'ala nka: M'gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M'gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.
7 M'gēnye kwa ha obi imaram, na Mu onwem bu Jehova: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: n'ihi na ha gēji obi-ha nile laghachikutem.
8 Ma dika fig ọjọ ndia, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha; n'ezie otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya, na ndi Jerusalem fọduru, bú ndi fọduru n'ala nka, na ndi bi n'ala Ijipt, nye: