21 na Edom, na Moab, na umu Amon;
22 na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n'ofè oké osimiri;
23 Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;
24 na eze nile nke Arebia, na eze nile nke ndi gwara ọgwa ndi bi n'ọzara;
25 na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia;
26 na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n'ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n'elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha.
27 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti unu.