5 ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n'isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;
6 M'gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M'gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.
7 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile we nu ka Jeremaia nēkwu okwu ndia n'ulo Jehova.
8 O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n'iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu.
9 Gini mere i buworo amuma n'aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n'ebe Jeremaia nọ n'ulo Jehova.
10 Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n'ulo eze rigota n'ulo Jehova; ha we nọdu ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.
11 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.