19 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n'obodo a,
20 nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;
21 e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n'ulo Jehova na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si:
22 na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M'gēleta ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M'gēbugota ha, bulata n'ebe a.