5 Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, n'anya ndi-nchu-àjà, na n'anya ndi Israel nile ndi nēguzo n'ulo Jehova,
6 o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n'ala ọzọ, si na Babilon lata n'ebe a.
7 Nání, biko, nuru okwua nke mu onwem nēkwu na nti-gi abua, na na nti ndi nka nile:
8 Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe.
9 Onye-amuma nke nēbu amuma bayere udo, mb͕e okwu onye-amuma ahu gērè, agāmara onye-amuma ahu, na Jehova ezitewo ya n'ezie.
10 Hananaia, bú onye-amuma, we kopu nkpọrọ ahu n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, we b͕ajie ya.
11 Hananaia we kwue okwu n'anya ndi Israel nile, si, Otú a ka Jehova siri: Ọbuná otú a ka M'gāb͕ajipu yoke nke Nebukadneza, bú eze Babilon, n'olu mba nile tutu ogologo arọ abua eruzue. Jeremaia, bú onye-amuma, we la.