11 N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.
12 Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti.
13 Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.
14 M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.
15 N'ihi na unu asiwo, Jehova emewo ka ndi-amuma biliere ayi nime Babilon.
16 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere eze ahu nke nānọkwasi n'oche-eze Devid, baye-kwa-ra ndi nka nile nke bi n'obodo a, bú umu-nne-unu ndi nēsoghi unu pua ije n'ala ọzọ ebe emere ka unu je biri;
17 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M'gaje iziga n'etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M'gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.